Ụlọikpe amaala mmadụ 150 ikpe maka iyi ọha egwu

Cheta na Naịjirịa kpụpụrụ ọtụtụ mmadụ a na-enyo enyo n'ebubo iyi ọha egwu n'Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja, isiobodo Naịjirịa n'ụbọchị Mọnde 15 Juun, 2026.

Ebe foto si, Getty Images

Mgbe e biputara ya
Oge e ji agụ akụkọ nkeji 3

Ụlọikpe Ukwu dị n'Abụja amaala opekatampe mmadụ otu narị na iri ise ikpe maka ebubo iyi ọhaegwu dịka ụbọchị abụọ nke ikpe ahụ na-aga n'ihu na Naịjirịa gachara.

Nke a na-abịa dịka e kwuru na a na-atụ anya na mmadụ iri asatọ na anọ ndị ọzọ ga-apụta n'ihu ndị ọkaikpe taa bụ Wenezde 17 Juun 2026.

Cheta na Naịjirịa kpụpụrụ ọtụtụ mmadụ a na-enyo enyo n'ebubo iyi ọha egwu n'Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja, isiobodo Naịjirịa n'ụbọchị Mọnde 15 Juun, 2026.

Ka ọ dị ugbua, a na-enyocha ihe dịka mmadụ 600 n'ime usoro ikpe a.

Ọkaiwu ukwu nke Naịjirịa bụ Maazị Lateef Fagbemi gwara ndị ntaakụkọ na a na-ekpe ndị a na-enyo enyo ikpe maka ebubo ndị metụtara mpụ iyi ọha egwu.

AGF kwuru na elebara anya n'ikpe ihe dịka mmadụ 300 n'etiti Mọnde na Tuzde.

N'otu n'ime ikpe ndị a, a mara otu onye ọrụugbo dị afọ 55 na steeti Borno, Ali Mustapha, ikpe afọ iri na ise na-enweghị nhọrọ ntaramahụhụ maka izochi ozi gbasara ihe egwu nke otu Boko Haram n'obodo ya dị na Katara nke steeti Borno.

Nwoke ọzọ nke nkọwa ya gosiri na ọ bụ nna nke ụmụ iri na otu, a mara dịka Isa Isiaka ka ụlọikpe tụrụ mkpọrọ afọ iri abụọ maka ịjụ izigara gọọmenti etiti ozi gbasara ihe ndị Boko Haram mere.

E kwuru na ikpe na-aga n'ihu n'okpuru nchekwa siri ike, ndị na-enyocha obodo na mba ofesi, gụnyere Nigerian Bar Association na National Human Rights Commission, na-enyocha ya usoro ikpe ahụ.

Cheta na n'ime ikpe 508 metụtara iyi ọha egwu e wetara n'ụlọikpe, ndị ọrụ gọọmenti nwetara mmeri 386 site n'ịma ikpe bidoro n'afọ ise ruo mkpọrọ ebighị ebi.

Ndị ọchịchị kwuru na amaala mmadụ 386 n'ime ihe ruru ikpe mmadụ 508 metụtara iyi ọha egwu e wetara n'ụlọikpe e wetara n'ụlọikpe.

Naịjirịa akpụpụla mmadụ 400 ụlọikpe maka ebubo iyi ọhaegwu

Chetakwa na ọ bụ kemgbe ọtụtụ afọ, ka Naịjirịa na-enwe ọtụtụ mwakpo nakwa nsogbu nchekwa. Ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa anwụọla na mwakpo ndị a, ebe ọtụtụ ụlọ, ụgbọala lara n'iyi.

Ebe foto si, Getty Images

Gafere Ọkwa azụmahịa WhatsApp ma gaa n'ihu na-agụ
Anyị nọ na WhatsApp

Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.

Pịa aka ebe a ka i soro anyị

Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị

A ga-akpụpụ mmadụ narị anọ (400) a na-enyo enyo na ha bụ ndị na-eyi ọha egwu n'Ụlọikpe Ukwu dị n'Abuja, isiobodo Naịjirịa n'ụbọchị Mọnde 15 Juun, 2026.

Nke a bụ otu n'ime ọtụtụ mbọ gọọmenti Naịjirịa megide ajọ ọnọdụ nchekwa ma inweta udo, ezi nchekwa na igbochi ọgbaaghara dị n'ụdị ọbụla.

Cheta na a kpụpụkwara mmadụ narị ise (500) n'ụlọikpe n'ọnwa Eprel 2026 maka ebubo iyi ọha egwu na Naịjirịa. Ọ bụ mmadụ narị atọ na iri astọ na isii (386) ka a mara ikpe n'ime ndị ahụ.

Ndị a a na-akpụpụ ụlọikpe n'ụbọchị Mọnde bụ ndị e boro ebubo dị iche iche gụnyere nrụrụaka ego, ịkwado ndị na-eyi ọha egwu, inye ndị otu na-eyi ọha egwu Boko Haram nakwa otu ndị ọzọ nri nakwa ọtụtụ ebubo ndị ọzọ.

A na-ekwu na ikpe ha ga-enwe ọtụtụ ụbọchị ebe akụkọ kwuru na ụlọikpe pụrụiche kwụrụ chịm ilebanye anya n'ikpe e kwesịrị ịma ha.

Chetakwa na ọ bụ kemgbe ọtụtụ afọ, ka Naịjirịa na-enwe ọtụtụ mwakpo nakwa nsogbu nchekwa. Ọtụtụ ụmụafọ Naịjirịa anwụọla na mwakpo ndị a, ebe ọtụtụ ụlọ, ụgbọala lara n'iyi.

Mwakpo ndị a na-emekarị na mpaghara ugwu Naịjirịa, achụpụla ọtụtụ mmadụ n'ụlọ ha nakwa n'obodo ha.

Ndị a na-eyi ọha egwu amalitela iwere ọnọdụ na mpaghara ndịda Naịjirịa dịka ndị ojiegbe dị iche iche na-atọrọ ndị mmadụ iji napụ ezinaụlọ ha ego mgbapụta bekee kpọrọ 'ransom'.

Ọ bụ ụlọakwụkwọ nakwa ime obodo ka ndị ojiegbe a na-awakpokarị.